Psalms 23

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya.
4A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.

5Ị na-akwado tebul
Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a.
nʼihu m,
nʼanya ndị iro m.
I tere isi m mmanụ
Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.

iko m na-ejubiga oke.
6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị
mgbe niile ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU